If I Must Die...

Ọ bụrụ na m ga-anwụrịrị

Translated to Igbo by

Ọ bụrụ na m ga-anwụrịrị,

ị ga-adịrịrị ndụ

ka ị wee kọọ akụkọ m

ka i wee ree ihe m nwere

were ya zụọ otu ukwu akwa

na eriri ole na ole,

(mee ka ọ dịrị ọcha ma nwekwaa ogologo ọdụ)

ka ọ ga-abụ otu nwata, nke nọ n'otu mpaghara Gaza

na-ele eluigwe anya na mkpụrụ anya

ebe ọ na-eche nna ya pụrụ njem n'otu ntabi anya—

na agwaghị onye ọ bụla ka m bịa

ọbụladị ezinụụlọ ya

ọbụladị onwe nke ya—

hu egbe ahụ, egbe m nke i ji aka gị rụọ, ebe ọ na-efegharị n'elu

ka o chee n'ime obi ya na ọ bụ mmụọ ọma na-abịa

iweghachitere ya ịhụnanya

Ọ bụrụ na m ga-anwụrịrị

ya bute olileanya

ya bụrụ akụkọ dị egwu


Select poem translation

A poem by Refaat Alareer.